Na ụbọchị taa anyị ga akọ akụkọ ifo banyere Ihe Agụụ Na-Ebute... Ije Ụtarịa Na Mbe

Ọdịnanị :The Sacred Arts and Science of the Igbo People.

Ụmụnne m uhụrụ chi ọma nụ oooo..Ama m na taata bụ ahịa Orie wetara anyị ihe ọma?

Na ụbọchị taa anyị ga akọ akụkọ ifo banyere Ihe Agụụ Na-Ebute... Ije Ụtarịa Na Mbe

Ifo dee!!!!!!
i dee!!!!!!!!!!!!

O nwere otu ụbọchị!!!!!!!!!!!!!!!
Otu ụbọchị wee ruo!!!!!!!!!!!

Nkịta nyara akpa?
nsị agwụ n’ọhịa!!!!!!

Akụkọ a mere n’oge nnukwu ụganị na ụnwụ dara n’obodo ụmụ anụmanụ.
Agụụ mee gị ihe o mere Mbe, i gaghị ata ya ụta n’ije aghụghọ màọbụ arụrụala ọbụla o jere.
Agụụ kwekatara egwu n’afọ Mbe, ọ gwa nwunye ya na ya ga-apụ njem.
Njem a ọ ga-eje bụ maka ịchọ ihe oriri. O kwuru na ọ ka mma na ọ nwụrụ n’ụzọ, karịa ịnọ n’ụlọ nwụọ n’agụụ, ndị nna ya ochie agaghị anabata ya ma ọ nwụọ ụdị ọnwụ ahụ. Nwunye ya bu Anịm kwuru na ọ ga-eso ya. Ha abụọ were kwopu ije.

Ka ha gara ije a ihe dịka ụbọchị abụọ na-ahụghị ihe ọbụla, nwunye Mbe fere n’isi na ọ ga-alaghachi azụ, ọ kaara ya mma ịnwụ n’ụlọ karịa ịnwụ n’ọhịa.
Naanị Mbe were gàba ya bụ ije. Mbe gakatara ije a, anya achaba ya ọbara ọbara.
Mana chi nwa ehi na-enweghị odụdụ na-achụrụ ya ijiji. Ka o ruru otu ugwu ka o zuo ike, ọ hụrụ ọnụ abụọ dị na ya bụ ugwu.
Kedu ihe anya ya hụrụ? N’otu ọnụ ahụ, nnukwu ụtara akpụ nọ n’ihu ya, n’ọnụ nke ọzọ ofe onugbo na-ekpo ọmalịcha ikpo nọ n’ihu ya.
I bụrụ mbe kedu ihe i ga-eme? Agụụ nile di ya n’ime, mere vịaaam.
O kwuru na chi ya agoziela ya, o sekpuru ala kele nna nna ya.
O were nwayọọ ga ka o buru ya bụ ụtara... ụtara ahụ emepe ọnụ gwa ya na ha abụọ ga-agba mgba, o merie ya , o rijuo afọ.
Hmmm ihe nke a tụrụ Mbe na anya, o hichara anya ya jụọ kedu ka ya na ụtara ga-esi gbaa mgba....

Nọnyere anyị na n'ihi na nke bu akụkụ na abịa.. Chere akụkụ a nke Abụọ..

#OdinaniDibaraGboo
#odinaniBuNdu
#igboCulture
#igboamaka
#Igbotic
#igbonified

#Ecc

Comments

Popular posts from this blog

What is "AGWU" Part 1

What is AGWỤ Part 2

MEANING OF ỌJỊUGO AS A GIVING NAME AND AS A KOLANUT